1 Ihe e mere 1:1-54 BIU

[1] Adam, Set, Enọsh, [2] Kenan, Mahalalel, Jared, [3] Enọk, Metusela, Lamek, na Noa. [4] Ụmụ Noa bụ Shem, Ham, na Jafet. [5] Ụmụ ndị ikom Jafet bụ: Goma, Magog, Madai, Javan, Tubal, Meshek na Tiras. [6] Ụmụ ndị ikom Goma bụ Ashkenaz, na Rifat, na Togama. [7] Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim. [8] Ụmụ ndị ikom Ham bụ: Kush, Ijipt, Put na Kenan. [9] Ụmụ ndị ikom Kush bụ: Seba, Havila, Sabta, Raama, na Sabteka. Ụmụ ndị ikom Raama bụ: Sheba na Dedan. [10] Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa. [11] Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh, [12] ndị Patrus, na ndị Kasluh (onye ndị Filistia sitere na ya) na ndị Kafto. [13] Kenan bụ nna Saịdọn, ọkpara ya, na ndị Het, [14] ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash, [15] ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini, [16] ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat. [17] Ụmụ ndị ikom Shem bụ Elam, Ashua, Apakshad, Lud na Aram. Ụmụ Aram bụ Uz, Hul, Geta na Meshek. [18] Apakshad bụ nna Shela; Shela bụrụ nna Eba. [19] Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Aha otu nʼime ha bụ Peleg, nʼihi na ọ bụ nʼoge ndụ ya ka e kewara ụwa; aha nwanne ya nwoke bụ Joktan. [20] Joktan bụ nna Almodad, Shelef, Hazamavet, Jera, [21] Hadoram, Ụzal, Dikla, [22] Obal, Abimael, Sheba, [23] Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan. [24] Shem, Apakshad, Shela, [25] Eba, Peleg, Reu, [26] Serug, Nahọ, Tera [27] na Ebram, ya bụ Ebraham. [28] Ụmụ Ebraham mụrụ bụ Aịzik na Ishmel. [29] Ndị a bụ ụmụ ụmụ ha: Nebaiot (ọkpara Ishmel), Keda, Adbel, Mibsam, [30] Mishma, Duma, Masa, Hadad, Tema, [31] Jetua, Nafish na Kedema. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ishmel. [32] Ketura, iko nwanyị Ebraham, mụtaara ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. Jokshan mụtara ndị a: Sheba na Dedan. [33] Ụmụ ndị ikom Midian bụ: Efaa, Efe, Hanok, Abida na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Ketura. [34] Ebraham mụtara Aịzik. Ụmụ ndị ikom Aịzik bụ Ịsọ na Izrel. [35] Ịsọ mụrụ ndị a: Elifaz, Reuel, Jeush, Jalam na Kora. [36] Ụmụ Elifaz bụ Teman, Ọmaa, Zefi, Gatam na Kenaz, na Amalek, site na Timna. [37] Ụmụ ndị ikom Reuel bụ: Nahat, Zera, Shama, na Miza. [38] Ụmụ ndị ikom Sia bụ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana, Dishọn, Eza na Dishan. [39] Ụmụ ndị ikom Lotan bụ Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan. [40] Ụmụ ndị ikom Shobal bụ Alvan, Manahat, Ebal, Shefo na Onam. Zibiọn mụrụ Aịa na Ana. [41] Ana mụrụ Dishọn. Ụmụ Dishọn bụ Hamran, na Eshban, na Itran, na Keran. [42] Ụmụ ndị ikom Eza bụ Bilhan, na Zaavan, na Akan. Ụmụ ndị ikom Dishan bụ Uz na Aran. [43] Ndị a bụ ndị eze chịrị nʼEdọm tupu ndị Izrel enwee eze nke ha. Bela nwa Beoa, onye aha obodo ya bụ Dinhaba. [44] Mgbe Bela nwụrụ Jobab nwa Zera, onye Bozra nọchiri ya dịka eze. [45] Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye si nʼala Teman nọchiri ya dịka eze. [46] Mgbe Husham nwụrụ, Hadad nwa Bedad, onye meriri ndị agha Midia nʼọzara Moab, ghọrọ eze. Isi obodo ya bụ Avit. [47] Mgbe Hadad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya dịka eze. [48] Mgbe Samla nwụrụ, Shaul onye sitere na Rehobọt dị nʼakụkụ osimiri nọchiri ya dịka eze. [49] Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa, nọchiri ya dịka eze. [50] Mgbe Baal-Hanan nwụrụ, Hadad nọchiri ya dịka eze. Akpọrọ isi obodo ya Pai. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred, nwa nwa Mezahab. [51] Hadad mesịrị nwụọkwa. Ndịisi ọnụmara nʼEdọm bụ Timna, Alva, Jetet, [52] Oholibama, Elaa, Pinon, [53] Kenaz, Teman, Mibza, [54] Magdiel na Iram. Ndị a bụ ndịisi ọnụmara nʼEdọm.

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.