1 Ihe e mere 3:1-24 BIU
[1] Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel. [2] Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit [3] Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ. [4] Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ. [5] Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ. [6] Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet, [7] Noga, Nefeg, Jafia, [8] Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ. [9] Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị. [10] Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat, [11] na Joram, na Ahazaya, na Joash, [12] na Amazaya, na Azaraya, na Jotam, [13] na Ehaz, na Hezekaya, na Manase, [14] na Amọn, na Josaya. [15] Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ. [16] Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a, Jehoiakin nwa ya, na Zedekaya. [17] Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha: Shealtiel, nwa ya, [18] Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya. [19] Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ Zerubabel na Shimei. Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a: Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị. [20] E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed. [21] Ụmụ Hananaya mụrụ bụ Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya. [22] Ụmụ Shekanaya bụ ndị a: Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ. [23] Ụmụ Nearaya bụ ndị a, Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ. [24] Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a: Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.
