1 Ihe e mere 8:1-40 BIU
[1] Benjamin mụtara ụmụ ndị ikom ise. Aha ha nʼusoro dịka e si mụọ ha bụ: Bela nke mbụ, nke abụọ Ashbel, nke atọ Ahara, [2] nke anọ Noha, na nke ise Rafa. [3] Ndị ikom Bela mụrụ bụ Aada, Gera, Abihud, [4] Abishua, Neeman, Ahoa, [5] Gera, Shefufan na Huram. [6] Ụmụ Ehud ndị bụ ndịisi ezinaụlọ na Geba, ndị bụkwa ndị e si na Geba chụpụ mee ka ha gaa biri na Manahat bụ ndị a: [7] Neeman, Ahija na Gera, onye chụpụrụ ha na onye bụkwa nna Ụza na Ahihud. [8] A mụtara Shaharaim ụmụ ndị ikom na Moab mgbe ọ gbachara ndị nwunye ya abụọ bụ Hushim na Baara alụkwaghị m. [9] Nwunye ya Hodesh mụtara Jobab, Zibịa, Mesha, Malkam, [10] Jeuz, Sakia na Miama. Ndị a bụ ụmụ ya ndị ikom, ndị bụkwa ndịisi ezi. [11] Tupu ọ chụpụ nwunye ya Hushim, ọ mụtaara ya Abaịtub, na Elpaal. [12] Elpaal mụrụ ndị a: Eba, Misham, Shemed (onye wuru obodo Ono na Lod, na obodo nta gbara ha gburugburu). [13] Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Beriya, na Shema, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị bi nʼAijalon. Ọ bụ ha chụpụrụ ndị Gat site nʼobodo ahụ. [14] Beriya mụrụ Ahio, Shashak, Jeremot, [15] Zebadaya, Arad, Eda, [16] Maikel, Ishpa na Joha, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beriya. [17] Zebadaya, Meshulam, Hizki, Heba, [18] Ishmerai, Izlaya na Jobab bụ ụmụ Elpaal. [19] Jakim, Zikri, Zabdi, [20] Elienai, Ziletai, Eliel, [21] Adaya, Beraya na Shimrat bụ ụmụ Shimei. [22] Ishpan, Eba, Eliel, [23] Abdon, Zikri, Hanan, [24] Hananaya, Elam, Antotija, [25] Ifdeya na Penuel bụ ụmụ ndị ikom Shashak. [26] Jeroham mụrụ Shamsherai, Sheharaya, Atalaya, [27] Jaareshaya, Ịlaịja na Zikri bụ ụmụ ndị ikom Jeroham. [28] Ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị ndu, ndị bi na Jerusalem, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. [29] Jeiel nna Gibiọn biri na Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Maaka. [30] Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab, [31] Gedoa, Ahio na Zeka [32] na Miklot, onye bụ nna Shimea. Ha onwe ha bikwa ndị ụmụnna ha nso na Jerusalem. [33] Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal. [34] Jonatan mụrụ nwa nwoke a na-akpọ Merib-Baal, nna Maịka. [35] Ụmụ Maịka mụrụ bụ, Piton, Melek, Tarea na Ehaz. [36] Ehaz amụọ Jehoada nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza. [37] Moza mụrụ Binea, nna Rafa, nna Eleasa, nna Azel. [38] Azel mụrụ ụmụ ndị ikom isii ndị a: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel. [39] Eshek nwanne nwoke Azel mụrụ ndị ikom atọ: Ụlam, ọkpara ya na Jeush, na Elifelet. [40] Ụmụ Ụlam bụ dike na dimkpa ndị a zụrụ ịgba ụta. Ọnụọgụgụ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha dị otu narị na iri mmadụ ise, 150. Ha niile sikwa nʼebo Benjamin.
