Diuteronomi 17:1-20 BIU
[1] Achụrụla ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. [2] Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ ONYENWE ANYỊ nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya, [3] ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu, [4] ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel, [5] kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya. [6] Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara. [7] Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị. [8] Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi ONYENWE ANYỊ Chineke gị họpụtara, [9] nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ. [10] Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka. [11] Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla [12] Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ. [13] Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako. [14] Mgbe ị banyere nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.” [15] O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị. [16] Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.” [17] Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke. [18] Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze. [19] Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a. [20] Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.
