Izikiel 20:1-49 BIU
[1] O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta ONYENWE ANYỊ ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m. [2] Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, [3] “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ [4] “Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere. [5] Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.” [6] Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma. [7] Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.” [8] “ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt. [9] Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha. [10] Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara. [11] Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ. [12] Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, na-edo ha nsọ. [13] “ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara. [14] Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha. [15] Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma. [16] Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị. [17] Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara. [18] Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu. [19] Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile. [20] Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.” [21] “ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara. [22] Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha [23] E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa, [24] nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha. [25] Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ. [26] E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’ [27] “Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m. [28] Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ [29] Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’ ” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.) [30] “Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche? [31] Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase. [32] “ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu. [33] Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. [34] Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya. [35] Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu. [36] Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. [37] Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. [38] Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. [39] “ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m. [40] Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. [41] Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ. [42] Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. [43] Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere. [44] Unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara.’ ” [45] Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, [46] “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda. [47] Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke ONYENWE ANYỊ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile. [48] Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’ ” [49] Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’ ”
