[27] Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.