Job 19:1-29 BIU

[1] Job zara sị: [2] “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ? Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m? [3] Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m, ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha? [4] A sịkwarị na m bụ onye mmehie, ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara. [5] Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m, ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m, [6] mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m, were ụgbụ ya tụọ m gburugburu. [7] “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị. [8] Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m. [9] O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi. [10] Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi. [11] Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya. [12] Ndị agha ya ji ike na-abịa; ha ewuola mgbidi were nnọchibido m ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m. [13] “O meela ka ụmụnne m na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ. [14] Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m; ndị ezi enyi m niile echefuola m. [15] Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ; adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ. [16] Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m, ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya. [17] Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide; abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m. [18] Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo; ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara. [19] Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m [20] Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu. [21] “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m. [22] Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ? [23] “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ, [24] na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi. [25] Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ. [26] Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke. [27] Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a! [28] “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’ [29] unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha; nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha, mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”

About this translation

Life Bible app icon
Get the Life Bible app Read offline, sync highlights and notes, and study with your library on any device.