[1] Mgbe ahụ, Job zaghachiri: [2] “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị! [3] Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara. [4] Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu? [5] “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya. [6] Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. [7] Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya. [8] Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa. [9] Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya, [10] O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. [11] Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya. [12] Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab. [13] Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ. [14] Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”