1 Ihe e mere 15:1-29 BIU
[1] Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya. [2] Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ họpụtara ha ibu igbe ONYENWE ANYỊ na ije ozi nʼihu ONYENWE ANYỊ ruo mgbe ebighị ebi.” [3] Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya. [4] Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị: [5] Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. (120) Uriel bụ onyeisi ha. [6] Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. (220) Asaya bụ onyeisi ha. [7] Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. (130) Juel bụ onyeisi ha. [8] Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ (200). Shemaya bụ onyeisi ha. [9] Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. (80) Eliel bụ onyeisi ha. [10] Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. (112) Aminadab bụ onyeisi ha. [11] Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha, [12] “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya. [13] Na mbụ, ONYENWE ANYỊ Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.” [14] Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel ahụ. [15] Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu ONYENWE ANYỊ si dị. [16] Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene. [17] Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya, [18] tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ. [19] Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz. [20] Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị [21] Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị. [22] Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ. [23] Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị. [24] Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche. [25] Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ. [26] Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja. [27] Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ. [28] Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. [29] Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
