Jenesis 4:1-26 BIU
[1] Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka ONYENWE ANYỊ, amụtala m nwa nwoke!” [2] Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi. [3] Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara ONYENWE ANYỊ ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye. [4] Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. ONYENWE ANYỊ nabatara Ebel na onyinye ya, [5] ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ. [6] Ma ONYENWE ANYỊ jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? [7] Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.” [8] Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya. [9] Emesịa, ONYENWE ANYỊ jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?” [10] Ma ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala. [11] Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị. [12] Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.” [13] Ken zara ONYENWE ANYỊ, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu. [14] Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.” [15] ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, ONYENWE ANYỊ kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya. [16] Ken sitere nʼihu ONYENWE ANYỊ pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden. [17] Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke. [18] Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek. [19] Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila. [20] Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu. [21] Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi. [22] Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama. [23] Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. [24] Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” [25] Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.” [26] Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha ONYENWE ANYỊ.
