Jenesis 5:1-32 BIU
[1] Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke. [2] O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ. [3] Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set. [4] Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [5] Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ. [6] Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh, [7] Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [8] Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ. [9] Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan. [10] Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [11] Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise. [12] Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel. [13] Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [14] Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri. [15] Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared. [16] Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [17] Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise. [18] Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk. [19] Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [20] Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ. [21] Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela. [22] Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [23] Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. [24] Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya. [25] Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek. [26] Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [27] Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu. [28] Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke. [29] Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a ONYENWE ANYỊ bụrụ ọnụ.” [30] Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. [31] Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa. [32] Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
